Imakwa onye ana ekwu?
Nwa John Ugbo, so nabata uka Katolic n'obodo.
Nwunye EzeMalukwuo, oso gba izu na Holi Triniti,
Gbata CWO.
Odebe ego zone, aro kwulu aro,
N'enwero ntụpọ.
Onochiteanyanamba, Ojeozimba Parish,
Jegidoo jeruo Eziowelle, obodo Cardinal Arinze.
Nne m, inwagwee;
Gaa tuluugo Ito ogbo ụka.
Ochie dike nne m, gaa gaa na ọgwụ.
Ojaadili nwanyi, oti igwe dimkpa
Oji aka apido agu iyi; Npidonu.
Nwanyi ka nwoke, akwaa akwulu,
Ogba aka ali enu.
Dokinta imelekiti, imelekiti ife n'eku ume.
Ife nto gbalike, iwaa.
Inaa nwa, ichoo nwa nma, so gi,
Ochie dike nne m.
Agbala k'ibeya ogo,
Nnaa na agbalu egwu.
Ebube agbala, nwanyi umalasi,
Nwanyi imi piom.
Atu egwu agu, nne m.
Igwuu Ideoto, gwuo nmili Otuocha Aguleri.
Ehenu, and then, Oo gini ewe mee.
Afa okwu gi ubochi bulu gboo.
Ara na azu nwa, osie ozuo ọha,
Oo na taa buzi unyaa, unyaa bulu taa?
Nya diba godu, okwo ika noya?
Si mu eeyee nu, arinze Chukwu,
N'egwu adiroo.
Odi nchefu?
Mbanu.
Odina omuma atu.
Oge echangee ego, maka afo 'Ntho fa,
Igbaa boolu, ichee goolu,
Izua n'Ochanja, ibujee n'Ezenwekwe.
Nga ekwu ofu ghalu ofu?
Oogwu iyi ukwu n'Otuocha Aguleri,
Okangba nwanyị, Agbala di nma, di ebube.
Ome ife nyiri nwoke.
Atu egwu agu, ochie dike nne m.
IGA ANOKA NKA, NA AHU IKE, TUTULIA.