O buru na Nnamdi Azikiwe bu onye Igbo
Ma bie aha ya n'obodo
Si nna m kpobam Igbo
Maka ubara mu n'asu Igbo
O buru na Chike Obi bu onye Igbo
Ma kpughee ihe gbara mmadu n'ile harii
Gwa ndi ikwu n'ibem
Ka ndi ezi anyi zaba aha ya
Gwanu umu anyi
Na ha echefukwala Christopher Okigbo
Onye ji mkpisi odee egbu oja
N'ihi na ndu ya niile bu Igbo
Onye obula n'amaghi Ojukwu
Amaghi na uwa di
Nkea bu nke anyi
Ojukwu bu agu nwoke
Kedu onye siri na Igbo enweghi mmadu
Kedu maka Joseph Achuzie
Onye sachapuru obara ojio
Nke choro ibata na ala Igbo
Kedu maka Michael Okpara
Nwoke turu ntuala nke ndi okpara
Onye na anubeghi maka aha a
Ekwubeghi eziokwu mbu na ndu ya
Akanu Ibiam bu nnukwu ihe mere Igbo
Igbo bu agburu
Igbo bu mmuo
Igbo ka Akanu Ibiam bu
(c)EKWUEME KC
This poem has not been translated into any other language yet.
I would like to translate this poem